10 O we jikọta ákwà-nkwuba ise, otù na ibe-ya: jikọta kwa ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ, otù na ibe-ya.
11 O ji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu: otú a ka ọ me-kwa-ra n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.
12 Ọgu anya-nko abua na iri ka o mere n'otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka ọ me-kwa-ra nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua: anya-nko cheritara onwe-ha iru, otù na ibe-ya.
13 O me-kwa-ra ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu we buru otù.
14 O me-kwa-ra ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n'elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka o mere ha.
15 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na iri, cubit anọ ka obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu nwere.
16 O jikọta-kwa-ra ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche.