24 ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka o me-kwa-ra n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.
25 O we mere akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu orú ibo, bú akuku Ugwu,
26 na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.
27 Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka o me-kwa-ra ibo isi nye.
28 Ibo abua ka o me-kwa-ra nye nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya.
29 Ha bu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua bu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka o mere nye ha abua na nkuku abua ahu.
30 Ha di kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.