29 Ha bu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua bu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka o mere nye ha abua na nkuku abua ahu.
30 Ha di kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.
31 O me-kwa-ra nkpọrọ osisi acacia; ise ka o mere nye ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu,
32 nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka o me-kwa-ra nye ibo nke ebe-obibi ahu, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu.
33 O we me ka nkpọrọ etiti gabiga n'etiti ibo ahu, si n'otù nsọtu rue nsọtu ọzọ.
34 Ọ machita-kwa-ra ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu, ọ machita-kwa-ra nkpọrọ ahu ọla-edo.
35 O we me ákwà-nb͕ochi ahu nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ bu ọlu onye-ọ̀kà, o mere ya ka o yie cherubim.