4 Ndi-amam-ihe ahu nile, ndi nēje ozi nile nke ebe nsọ ahu, ha nile n'otù n'otù we si n'ozi-ha nke ha nēje bia,
5 gwa Moses okwu, si, Ndi Israel nēweta ọtutu ihe kari nke gēzuru òfùfè nke diri ozi ahu nke Jehova nyere iwu ka eje ya.
6 Moses we nye iwu, ha we me ka ekwusa ya n'ọmuma-ulo-ikwū nile, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, ka ha ghara ije ozi ọzọ bayere àjà-nbuli nke ebe nsọ ahu. Ewe me ka ndi Israel wetabìe ihe.
7 Ihe-ije-ozi ahu we zuere ha iji je ozi nile, ime ya, ihe we fọdu.
8 Onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe n'etiti ndi nēje ozi ahu we me ebe-obibi ahu: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu nke onye-ọ̀kà, ihe ndia ka o ji me ha.
9 Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile nwere.
10 O we jikọta ákwà-nkwuba ise, otù na ibe-ya: jikọta kwa ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ, otù na ibe-ya.