7 O me ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku abua nke ebe-ichu-àjà ahu, ka ewe were ha nēbu ya; o were ibo me ya ka ọ di ka ib͕e.
8 O me-kwa-ra ite ọsisa-miri, ọ bu ọla, ukwu-ala-ya bu kwa ọla: ọ bu enyo nke ndinyom nēzukọ n'usu n'usu, ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ka o ji me ya.
9 O me-kwa-ra ogige ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida nwere ákwà-ngechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo:
10 ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.
11 Akuku Ugwu nwe-kwa-ra ọgu cubit ise, ide-ha di orú, ukwu-ha di kwa orú, ha bu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.
12 Akuku Ọdida-anyanwu nwe-kwa-ra ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri, ide-ha di iri, ukwu-ha di kwa iri; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha bu ọla-ọcha.
13 Akuku Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu, nwekwara ọgu cubit abua na iri.