6 Ha mekwara nkume onyx ahu, nke emere ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu, nke eb͕uru ha eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di.
7 O tiye ha n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: dika Jehova nyere Moses iwu.
8 Ọ mekwara ihe-ib͕ochi-obi ahu, ọ bu ọlu nke onye-ọ̀kà, dika ọlu aluru n'ephod ahu; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.
9 Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka o bu; ha mere ihe-ib͕ochi-obi ahu ka ọ buru ihe apiajiri apiaji: ntù-aka ka ogologo-ya di, ntù-aka ka obosara-ya di kwa, mb͕e apiajiri ya.
10 Ha hiọgide-kwa-ra nime ya ariri nkume anọ: ariri sardius na topaz na carbuncle bu ariri mbu.
11 Ariri nke-abua bu emerald na sapphire na diamond.
12 Ariri nke-atọ bu jacinth na agate na amethyst.