17 O rue n'ọnwa mbu n'arọ nke-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ.
18 Moses we guzo ebe-obibi ahu ọtọ, tiye ukwu-ya nile, guzo ibo-ya nile ọtọ, tiye nkpọrọ-ya nile, guzo ide-ya nile ọtọ.
19 Ọ we b͕asa ulo-ikwū ahu n'elu ebe-obibi ahu, tukwasi ya ihe-nkpuchi nke ulo-ikwū ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu.
20 O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu:
21 o webata ib͕e ahu n'ebe-obibi ahu, do ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, we kwuchi ib͕e ihe-àmà ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.
22 O tiye table ahu n'ulo-ikwū nzute, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu, n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu.
23 O do usoro achicha n'usoro n'elu-ya n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.