22 O tiye table ahu n'ulo-ikwū nzute, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu, n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu.
23 O do usoro achicha n'usoro n'elu-ya n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.
24 Ọ dọba ihe-idọba-oriọna ahu nime ulo-ikwū nzute, na ncherita-iru table, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.
25 O welie oriọna ahu nile n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.
26 O tiye ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu n'ulo-ikwū nzute n'iru ákwà-nb͕ochi ahu:
27 o we sure n'elu ya ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me; dika Jehova nyere Moses iwu.
28 Ọ tukwasi ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n'ebe-obibi ahu.