9 Moses we gwa umu Israel okwu otú a: ma ha egeghi Moses nti site n'enweghi-ntachi-obi nime mọ-ha, site kwa n'òfùfè siri ike.
10 Jehova we gwa Moses okwu, si,
11 Bà gwa Fero, bú eze Ijipt, okwu, ka ọ we zipu umu Israel n'ala-ya.
12 Moses we kwue n'iru Jehova, si, Le, umu Israel egeghm nti; Fèro gēsi kwa aṅa nuru olum, onye mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu?
13 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, nye ha iwu n'ebe umu Israel nọ, na n'ebe Fero eze Ijipt nọ, ime ka umu Israel si n'ala Ijipt pua.
14 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha: umu-ndikom Reuben, bú ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami: ndia bu ab͕uru Reuben.
15 Umu-ndikom Simeon kwa; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu: ndia bu ab͕uru Simeon.