18 Le, dika mb͕e a echi M'gaje ime ákú-miri-ígwé di arọ́ nke-uku ka o zo, nke ákú-miri-ígwé dika ya nādighi n'Ijipt site n'ubọchi atọrọ ntọ-ala-ya we rue ub͕u a.
19 Ma ub͕u a, ziga, me anu-ulo-gi na ndi nile i nwere n'ọhia ka ha laghachi n'ulo ọsọsọ; madu ọ bula na anumanu ọ bula nke agāhu n'ọhia, nke agaghi-achikọta ha n'ulo, ákú-miri-ígwé ahu gādakwasi ha, ha we nwua.
20 Onye nātu egwu okwu Jehova n'etiti ndi-orù Fero mere ndi-orù-ya na anu-ulo-ya ka ha b͕aghachi n'ulo:
21 ma onye nētiyeghi obi-ya n'okwu Jehova rapuru ndi-orù-ya na anu-ulo-ya n'ọhia.
22 Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ákú-miri-ígwé we di n'ala Ijipt nile, n'aru madu, na n'aru anumanu, na n'aru ihe-ọkukú ọ bula nke ubi, n'ala Ijipt.
23 Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'iru elu-igwe: Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na ákú-miri-ígwé, ọku we nējeru ala; Jehova we me ka ákú-miri-ígwé zokwasi ala Ijipt.
24 Ákú-miri-ígwé we di, ọku nānwude kwa onwe-ya n'etiti ákú-miri-ígwé ahu, di arọ́ nke-uku, nke ihe dika ya nādighi n'ala Ijipt nile site na mb͕e ọ ghọrọ mba.