2 Ma ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe: ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.
3 Ya mere ihe ọ bula unu kwuru n'ọchichiri, agānu ya n'ìhè; ihe unu kwu kwa-ra na nti n'ime-ulo ntà, agēkwusa ya n'elu ulo.
4 Ma asim unu ndi-eyim, Unu atula egwu ndi nēb͕u aru, ma emesia ha enweghi ihe ọzọ kari nke ahu ha gēme.
5 Ma M'gēgosi unu Onye unu gātu egwu: tuanu egwu Onye ahu, Nke nwere ike itubà n'ọku ala-mọ mb͕e O b͕usiri; e, asim unu, Tuanu egwu Onye ahu.
6 Àdighi-ere egwele ise na penny abua? ma adighi-echezọ otù nime ha n'iru Chineke.
7 Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele.
8 Ma asim unu, Onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Nwa nke madu gēkwuputa kwa n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke: