3 Jisus we za, gwa ndi-iwu na ndi-Farisi okwu, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu na o zighi ezi?
4 Ma ha kpuchiri ọnu. O we jide ya aka, me ka aru di ya ike, we rapu ya ka ọ la.
5 O we si ha, Ọ̀ bu nwa-nwoke ma-ọbu ehi nke onye n'etiti unu gādabà n'olùlù-miri, ma onye ahu agaghi-adọkpulite ya elu ngwa ngwa n'ubọchi-izu-ike?
6 Ma ha enweghi ike iza okwu ndia ọzọ.
7 O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha,
8 Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n'oriri ọlulu-nwunye, anọdula n'isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru,
9 onye kpọrọ gi na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mb͕e ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu.