3 otù nwanyi nke di-ya nwuru nọ kwa n'obodo ahu; nwanyi ahu we nābiakute ya, nāsi, Kpeputam n'aka onye-irom.
4 Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n'onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu;
5 ma n'ihi na nwanyi a di-ya nwuru nēsobum, m'gēkpeputa ya, ka ọ ghara ime ka ike gwusiam site n'ọbibia ọ nābia mb͕e nile.
6 Onye-nwe-ayi we si, Nurunu ihe onye-ikpé nke nēme ajọ omume kwuru.
7 Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n'ebe ha nọ?
8 Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa?
9 O we tu kwa ilu a nye ufọdu ndi tukwasiri obi n'onwe-ha na ha bu ndi ezi omume, ndi kpọkwara ndi nile fọduru ihe-efu: