40 O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu.
41 Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,
42 si, Ọ buru na i mara n'ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n'anya-gi.
43 N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile,
44 tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi.
45 O wee ba n'ulọ uku Chineke, malite ichupu ndi nēre,
46 nāsi ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ulom gābu kwa ulo ekpere: ma unu onwe-unu mere ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.