29 N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa.
30 Mb͕e ahu ka ha gāmalite isi ugwu, Dakwasinu ayi; na isi ugwu ntà, Kpuchienu ayi.
31 N'ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku?
32 Ma ndikom abua ọzọ, ndi nālu ọlu ọjọ, ka edukwara, Ya na ha, ka eb͕ue ha.
33 Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya.
34 Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà.
35 Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara.