33 Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya.
34 Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà.
35 Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara.
36 Ndi-agha we me kwa Ya ihe-ọchì, nābiakute Ya, nēche kwa n'iru Ya manya-vine b͕ara uka,
37 si, Ọ buru na Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju, zọputa Onwe-gi.
38 Ma ihe-ndekwasi di kwa n'elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU.
39 Otù nime ndi ahu nālu ọlu ọjọ ndi akwubara nēkwulu kwa Ya, si, Gì onwe-gi abughi Kraist ahu? zọputa Onwe-gi na ayi.