1 Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n'usọ ọdọ-miri Genesaret;
2 O we hu ub͕ọ abua ka ha guzoro n'usọ ọdọ-miri ahu: ma ndi-ọkù esiwori nime ha pua, ha nāsa kwa ihe ha ji eb͕u azù.
3 O we ba n'otù nime ub͕ọ abua ahu, nke bu nke Saimon, we kpere ya ka o si n'ala nupu nke-ntà. O we nọdu, si n'ub͕ọ nēzí ìgwè madu nile ihe.
4 Ma mb͕e O kwubìri okwu, Ọ si Saimon, Nupu n'ob͕u-miri, wunyenu ihe unu ji eb͕u azù ka unu b͕ue azù.
5 Saimon we za, si, Nna-ayi, ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu ogologo abali a dum, ma ayi eb͕utaghi ihe ọ bula: ma n'okwu-Gi m'gāwuye ihe eji eb͕u azù.
6 Mb͕e ha mesiri nka, ha we nwuta oké ìgwè azù, ihe-ha eji eb͕u azù we nādọka;
7 ha we fere ndi-nketa-ibe-ha aka, bú ndi nọ n'ub͕ọ-ha ọzọ, ka ha bia nyere ha aka. Ha we bia, b͕ujue ub͕ọ̀ abua ahu, ya mere ha malitere imìkpu.