9 N'ihi na ibobo ob͕ub͕u azù ha b͕uru nwuru ya na ndi nile ya na ha nọ n'aru;
10 otú ahu ka ibobo nwu-kwa-ra Jemes na Jọn, umu Zebedi, n'aru, ndi ha na Saimon bu ndi-nnweko. Jisus we si Saimon, Atula egwu; site n'ub͕u a i ganānwuta madu na ndu.
11 Mb͕e ha tinyere ubọ-ha n'ala, ha we rapu ihe nile, so Ya.
12 O rue, mb͕e Ọ nọ n'otù nime obodo ahu, le, otù nwoke nke ekpenta juputara n'aru: ma mb͕e ọ huru Jisus o da kpuchie iru-ya n'ala, riọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha.
13 O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya.
14 Ya onwe-ya we nye ya iwu ka ọ ghara igwa onye ọ bula: Ọ si kwa ya, Kama laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha, dika Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà.
15 Ma okwu bayere Ya fesakariri nke-uku: oké ìgwè madu we nāb͕akọ inu okwu-Ya, ka ewe me kwa aru-ha nke nādighi nma ka ọ di ike.