1 Mbe ha nābiaru Jerusalem nso, rue Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu Olive, o we ziga madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya,
2 si ha, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu: ngwa ngwa mb͕e unu nābà nime ya, unu gāhu nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasighi; tọpunu ya, sekputa ya.
3 Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu, Gini mere unu nēme nka? sinu, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa Ọ gēzighachi ya n'ebe a ọzọ.
4 Ha we je, hu nwa-inyinya-ibu elibere n'ọnu-uzọ n'èzí n'amá; ha we tọpu ya.
5 Ufọdu nime ndi guzoro n'ebe ahu we si ha, Ùnu nēme gini, nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu?
6 Ha we gwa ha okwu dika Jisus kwuru: ha we rapu ha.