14 ebe ọ bula ọ gābà kwa, sinu nna-nwe ulo, Onye-ozizí si, Òle ebe ulo-ọbìa edeberem di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga?
15 Ya onwe-ya gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo dozi kwa: n'ebe ahu dozienu ihe nye ayi.
16 Ndi ahu nēso uzọ-Ya we pua ba n'obodo, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.
17 Mb͕e o ruru anyasi Ya na ndi-ozi iri na abua ahu we bia.
18 Mb͕e ha nānọdu na nri nēri kwa ihe, Jisus we si, N'ezie asim unu, Otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye, bú onye Mu na ya nēri ihe.
19 Ọ malitere iwuta ha, ha malite-kwa-ra isi Ya n'otù, Ọ̀ bu mu?
20 Ma Ọ siri ha, Ọ bu otù onye nime unu iri na abua, onye nke Mu na ya nēsukọ nri n'afere.