44 Ma onye nārara Ya nye nyere ha-ri ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya; jidenu Ya, lezienu anya duru Ya je.
45 Mb͕e ọ biara, ngwa ngwa ọ biakutere Ya, si, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku.
46 Ha we tukwasi Ya aka, jide Ya.
47 Ma otù onye n'etiti ndi guzoro nso miputara mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti-ya.
48 Jisus we za, si ha, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe?
49 Kwa-ubọchi Mu na unu nọ n'ulo uku Chineke ebe M'nēzí ihe, ma unu ejideghm: ma emere nka ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.
50 Ha nile we rapu Ya, b͕alaga.