49 Kwa-ubọchi Mu na unu nọ n'ulo uku Chineke ebe M'nēzí ihe, ma unu ejideghm: ma emere nka ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.
50 Ha nile we rapu Ya, b͕alaga.
51 Ma otù okorọbia sonyere Ya, onye b͕okwasiri ezi ákwà ọcha n'aru ọtọ ya: ha we jide ya:
52 ma ọ rapuru ezi ákwà ọcha ahu, b͕ara ọtọ, b͕alaga.
53 Ha we si n'ebe ahu duru Jisus jekuru onye-isi-nchu-àjà: ha nile, bú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, we b͕akọ n'ebe ọ nọ.
54 Pita soro kwa Ya-ri n'ebe di anya, rue nime ulo, nime obí onye-isi-nchu-àjà; ọ nānọdu kwa n'etiti ndi nēje ozi, ọ nānya ọku n'ihè ọku.
55 Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà imegide Jisus ime ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi.