54 Pita soro kwa Ya-ri n'ebe di anya, rue nime ulo, nime obí onye-isi-nchu-àjà; ọ nānọdu kwa n'etiti ndi nēje ozi, ọ nānya ọku n'ihè ọku.
55 Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà imegide Jisus ime ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi.
56 N'ihi na ọtutu madu nāb͕a àmà ugha imegide Ya, àmà-ha abughi kwa otù.
57 Ufọdu we bilie, b͕a àmà ugha megide Ya, si,
58 Ayi onwe-ayi nuru ka Ọ nāsi, Mu onwem gākwatu ulo nsọ a nke ejiri aka me, n'ubọchi atọ M'gēwu kwa ulo ọzọ nke anējighi aka me.
59 Ọbuná otú a àmà-ha abughi kwa otù.
60 Onye-isi-nchu-àjà we bilie n'etiti, jua Jisus, si, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi?