8 Ngwa ngwa ebe Jisus mazuru nime mọ-Ya na ha nātule okwu nime onwe-ha otú a, Ọ si ha, Gini mere unu nātule ihe ndia n'obi-unu?
9 Òle nke ka nfe, isi onye akuku-aru-ya nwuru anwu, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, chiri ute-gi, jeghari kwa?
10 Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie, (Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu),
11 M'si gi, Bilie, chiri ute-gi, la n'ulo-gi.
12 O we bilie, chiri ute-ya ngwa ngwa, pua n'iru ha nile; nke mere ka ibobo nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula ayi huru ya otú a.
13 O we pua ọzọ ga n'usọ oké osimiri; ìgwè madu ahu nile we nābiakute Ya, Ọ nēzí kwa ha ihe.
14 Mb͕e Ọ nāga, Ọ hu Livai nwa Alfiọs, ka ọ nọduru n'ulọ-ùtú, Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya