23 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.
24 O we si ha, Lezienu anya ihe unu nānu: ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu: agēnye kari kwa unu.
25 N'ihi na onye nwere, onye ahu ka agēnye: onye nēnweghi kwa, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.
26 O we si, ọ bu otu a ka ala-eze Chineke di, ọ di ka mb͕e madu tupuru nkpuru n'ala;
27 we raru ura teta kwa abali na ehihie, nkpuru ahu we pue tó kwa, onye ahu amaghi ka o si me.
28 Ala nāmi nkpuru site n'onwe-ya; mbu npute, emesia oko, emesia ọka kara aka n'oko.
29 Ma mb͕e ọ bula nkpuru chara, ngwa ngwa o were mma-iwe-ihe-ubi webe, n'ihi na mb͕e owuwe-ihe-ubi abiawo.