2 Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche, nání ha: O we nwogha n'iru ha:
3 uwe-Ya nile we nēnwupu, nācha oké ucha; dika onye ọ bula nke nēme ka ákwà di ocha n'uwa nāpughi ime ka ha di ọcha.
4 Ewe me ka ha hu Elaija na Moses: ha na Jisus nēkwurita kwa okwu.
5 Pita we za, si Jisus, Rabai, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija.
6 N'ihi na ọ maghi ihe ọ gāza; n'ihi na ha nātu oké egwu.
7 Igwe-oji we bia kpuchie ha: olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya: nurunu okwu-Ya.
8 Na mberede, mb͕e ha lere anya buruburu, ha ahughi onye ọ bula ọzọ, ma-ọbughi nání Jisus, Ya na ha.