1 O rue, mb͕e Jisus nyebìri ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya iwu, O si n'ebe ahu pua izí ihe na ikwusa n'obodo nile ha.
2 Ma mb͕e Jọn nuru n'ulo-nkpọrọ ọlu nile nke Kraist ahu, o ziga ozi site n'aka ndi nēso uzọ-ya,
3 si Ya, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye di iche?
4 Jisus we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu nānu na nke unu nāhu:
5 ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi-ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.
6 Ngọzi nādi-kwa-ra onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.