19 Nwa nke madu biara nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, eyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! Agu-kwa-ra amam-ihe n'onye ezi omume site n'ọlu-ya nile.
20 Mb͕e ahu ka Ọ malitere ita obodo ahu uta, bú nke Ọ lukariri ọlu-Ya di ike nime ha, n'ihi na ha echègharighi.
21 Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga n'ákwà-nkpe na ntu.
22 Otú ọ di, asim unu, Taia na Saidon gānagide okwu n'ubọchi ikpé, kari unu.
23 Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? i gārida rue Hedis: n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Sọdọm nke aluru nime gi, ọ gānọgidewori rue ta.
24 Otú ọ di, asim unu, na ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari gi.
25 N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: