2 Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike.
3 Ma Ọ siri ha, Ùnu agughi ihe Devid mere, mb͕e agu guru ya, na ndi soro ya;
4 otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?
5 Ma-ọbu ùnu agughi n'iwu, na ndi-nchu-àjà nēmeru ubọchi-izu-ike n'ulo uku Chineke n'ubọchi-izu-ike, ma adighi-ata ha uta?
6 Ma asim unu, na Onye di uku kari ulo Chineke nọ n'ebe a.
7 Ma ọ buru na unu marari ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà, unu agaghi-ekpeb͕u ndi adighi-ata ha uta.
8 N'ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.