25 Ma ebe Ọ matara ihe di ha n'obi Ọ si ha, Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agaghi-eguzo:
26 Ọ buru kwa na Setan achupu Setan, o kewara megide onwe-ya; àla-eze-ya gēsi kwa aṅa guzo?
27 Ọ buru kwa na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ìke onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.
28 Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Mọ nke Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.
29 Ma-ọbu màdu gēsi aṅa pu ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u? mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.
30 Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.
31 N'ihi nka ka M'ji si unu, Agāb͕aghara madu nmehie na nkwulu ọ bula; ma agaghi-ab͕aghara nkwulu ekwuluru Mọ Nsọ.