16 Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie.
17 Ha we si Ya, Ayi enweghi n'ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua.
18 O we si, Chita ha n'ebe a nyem.
19 O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n'elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile.
20 Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru.
21 Ma ndi riri ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri, nāgughi ndinyom na umu-ntakiri.
22 Ngwa ngwa O we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ, rue mb͕e Ya onwe-ya gēzilaga ìgwè madu nile.