7 Jisus we biakute ha, metu ha aka, si, Bilienu, unu atu-kwa-la egwu.
8 Ma mb͕e ha weliri anya-ha elu, ha ahughi onye ọ bula, ma-ọbughi nání Jisus.
9 Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie.
10 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Gini mere ndi-ode-akwukwọ ji si kwa na Elaija aghaghi ibu uzọ bia?
11 O we za, si, Ọ bu ezie na Elaija nābia, Ọ gēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu:
12 ma asim unu, na Elaija abiawori ub͕u a, ha amazughi kwa ya, kama ha mere n'aru-ya ka ihe ha chọrọ ra. Ọbuná otú a ka ha gaje ime kwa ka Nwa nke madu hu ahuhu.
13 Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya ghọtara na Ọ gwara ha okwu bayere Jọn Baptist.