25 Judas, onye nārara ya nye, we za, si, Ọ̀ bu mu, Rabai? Ọ si ya, Gi onwe-gi kwuru.
26 Mb͕e ha nēri ihe, Jisus we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya; O we nye ndi nēso uzọ-Ya, si, Naranu, rie; nka bu arum.
27 O we nara iko, kele kwa, we nye ha, si, Unu nile ṅua nime ya;
28 n'ihi na nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusiri ọtutu madu ka ewe b͕aghara nmehie.
29 Ma asim unu, M'gaghi-aṅu ma-ọli site n'ub͕u a n'ihe a si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e Mu na unu gāṅu ya ọhu n'ala-eze Nnam.
30 Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.
31 Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.