27 O we nara iko, kele kwa, we nye ha, si, Unu nile ṅua nime ya;
28 n'ihi na nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusiri ọtutu madu ka ewe b͕aghara nmehie.
29 Ma asim unu, M'gaghi-aṅu ma-ọli site n'ub͕u a n'ihe a si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e Mu na unu gāṅu ya ọhu n'ala-eze Nnam.
30 Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.
31 Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.
32 Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili.
33 Ma Pita zara, si Ya, Ọ buru na agēme madu nile ka ha ma n'ọnyà n'aru Gi, agaghi-eme ka mu onwem ma n'ọnyà mb͕e ọ bula.