1 Ma mb͕e ubọchi-izu-ike nāgwu, mb͕e chi ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa nābọ, Meri Magdalini na Meri ọzọ biara ile ílì ahu.
2 Ma le, ala-ọma-jijiji uku dara; n'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n'elu-igwe ridata, bia rue, bupu nkume ahu, we nọkwasi ya.
3 Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow:
4 site n'egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu.