23 Ya mere ọ buru na i nēche onyinye-gi n'iru Chineke n'ebe-ichu-àjà, i we cheta n'ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi,
24 rapu onyinye-gi n'ebe ahu n'iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n'udo, mb͕e ahu bia kwa che onyinye-gi.
25 Me ka gi na onye nēkuru gi ga ikpé me eyì ọsọsọ, mb͕e gi na ya nọ n'uzọ; ka onye ahu nēkuru gi ga ikpe we ghara irara gi nye n'aka onye-ikpe ma eleghi anya, onye ikpe arara kwa gi nye n'aka onye nēje ozi, ewe tubà gi n'ulo-nkpọrọ.
26 N'ezie asim i, I gaghi-aputa n'ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi farthing ikpe-azu.
27 Unu nuru na ekwuru, si, Akwala iko:
28 ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a.
29 Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ.