14 Mb͕e Jisus batasiri n'ulo Pita, O we hu nne nwunye-ya ka ọ tọb͕ọrọ n'aru-ọku.
15 O we metu aka-ya, aru-ọku ahu we rapu ya; o we bilie, nēje-kwa-ra Ya ozi.
16 Ma mb͕e o ruru anyasi, ha kutara Ya ọtutu madu ndi mọ ọjọ ji: O we were okwu-ọnu chupu ndi-mọ ahu, me kwa ndi nile aru nādighi nma ka aru-ha di ike:
17 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, Ya onwe-ya nara nriaria nile ayi, būru kwa ọria nile ayi.
18 Ma mb͕e Jisus huru na ọtutu ìgwè madu di Ya buruburu, O kwuru ka ha gabiga n'ofè ọzọ.
19 Otù ode-akwukwọ we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, m'gēso Gi ebe ọ bula I nēje.
20 Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.