30 Ewe saghe anya-ha. Jisus we dọ ha aka na nti nke-uku, si, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara ima ya.
31 Ma ha puru, b͕asa ùdé-Ya n'ala ahu dum.
32 Mb͕e ha nāpu, le, ekutara Ya onye-ob͕i nke mọ ọjọ ji.
33 Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n'aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n'Israel.
34 Ma ndi-Farisi nāsi, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.
35 Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.
36 Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha.