2 onye b͕ara àmà nke okwu Chineke, na nke àmà Jisus Kraist, ka ha ra, bú ihe ọ huru.
3 Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n'ihi na oge ahu di nso.
4 Jọn nēdegara nzukọ Kraist asa nke di n'Esia akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo, nke si n'aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye dikwari, Onye nābia kwa; nke si kwa n'aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n'iru oche-eze-Ya;
5 nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;
6 O we me ka ayi buru ala-eze, ndi-nchu-àjà nye Chineke na Nna nke Ya; ọ bu Ya ka otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
7 Le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya, ndi ahu gāhu kwa Ya, bú ndi mara Ya ube; ebo nile nke uwa gēti-kwa-ra ya aka n'obi. E, Amen.
8 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, ka Onye-nwe-ayi Chineke kwuru, bú Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye nābia kwa, Onye puru ime ihe nile.