8 Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'oghere ọnu-uzọ-ama: Siria Zoba, na Rehob, na ndikom Tob, na Meaka, nọrọ onwe-ha n'ọhia.
9 Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi nile arọputara arọputa n'Israel, do ha n'usoro izute Siria:
10 o tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, we do ha n'usoro izute umu Amon.
11 Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gābia kwa izọputa gi.
12 Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.
13 Joab na ndi soro ya we biarue agha ahu nso imegide Siria: ha we b͕alaga n'iru ya.
14 Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai, ba n'obodo. Joab we si n'ebe umu Amon nọ lata, biarue Jerusalem.