2. Samuel 19:5-11 IGBOB

5 Joab we bakuru eze n'ulo, si, I mewo ka ihere me iru ndi-orú-gi nile ta, bú ndi nēwepuga ndu-gi, na ndu umu-gi ndikom na nke umu-gi ndinyom, na ndu ndinyom-i, na ndu ndi-iko-gi nwayi, ta;

6 n'ihu ndi nākpọ gi asi n'anya, na n'ikpọ ndi nāhu gi n'anya asi. N'ihi na i gosiwo ta, na ndi-isi na ndi-orù abughi ihe n'anya-gi: n'ihi na amawom, ta, na asi na Absalom adiwo ndu, asi kwa na ayi nile anwuwo ta, mb͕e ahu o gēzi ezi n'anya-gi.

7 Ma ub͕u a bilie, pua, gwa ndi-orù-gi okwu gāba ha n'obi: n'ihi na aṅuwom iyi na Jehova, na ọ dighi otù nwoke gēsoro gi nọ ọnọdu abali a, ma asi na i gaghi-apu: ma nke ahu gājọrọ gi njọ kari ihe ọjọ nile nke biakwasiworo gi site ka i di na nwata rue ub͕u a.

8 Eze we bilie, nọdu n'ọnu-uzọ-ama. Ha we gosi ndi ya nile, si, Le, eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama: ndi ahu nile we bia n'iru eze.Ma Israel b͕alagara, nwoke o bula n'ulo-ikwū-ya.

9 Ndi Israel nile we nēse okwu n'ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n'ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n'ala b͕alaga n'ihi Absalom.

10 Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n'agha. Ma ub͕u a n'ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata?

11 Eze, bú Devid, we zigara Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, ozi, si, Gwanu ndi-okenye Juda okwu, si, N'ìhi gini ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata n'ulo-ya? ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n'ulo-ya?