13 Mb͕e ebupusiri ya n'uzọ atuliri atuli, ndikom nile gabigara iso n'azu Joab, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.
14 O we gabiga n'ebo nile nke Israel rue Ebel, na Bet-meaka, na ndi Bia nile: ewe kpọkọta ha, ha we bia so kwa ya n'azu.
15 Ha we bia nọchigide ya n'agha n'Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da.
16 Otù nwayi nke mara ihe we si n'obodo ahu kpọ òkù, si, Nurunu, nurunu; biko, sinu Joab, Biarue nso n'ebe a, ka m'gwa gi okwu.
17 O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄.
18 Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n'Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.
19 Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?