10 Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n'elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n'elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n'ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n'abali.
11 Ewe gosi Devid ihe Rizpa nwa Aia, nwayi bu iko Sọl, mere.
12 Devid we je chiri ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya n'aka ndi-nwe Jebesh-gilead, ndi zupuru ha n'amá Bet-shan, ebe ndi Filistia kwubara ha, n'ubọchi ndi Filistia tib͕uru Sọl nime Gilboa:
13 o we si n'ebe ahu chigota ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya; ha chikọta-kwa-ra ọkpukpu ndi akwubara.
14 Ha we lìe ọkpukpu Sọl na Jonatan nwa-ya n'ala Benjamin nime Zela, n'ílì Kish, bú nna-ya: ha we me ihe nile eze nyere n'iwu. Ewe riọta Chineke aririọ bayere ala ahu mb͕e ihe a gasiri.
15 Ma ndi Filistia nwere agha ọzọ ha nēbuso Israel; Devid we rida, ya na ndi-orù-ya, buso ndi Filistia agha; Devid we da #mbà.
16 Ishbi-benob, nke di n'etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n'ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.