14 Ha we lìe ọkpukpu Sọl na Jonatan nwa-ya n'ala Benjamin nime Zela, n'ílì Kish, bú nna-ya: ha we me ihe nile eze nyere n'iwu. Ewe riọta Chineke aririọ bayere ala ahu mb͕e ihe a gasiri.
15 Ma ndi Filistia nwere agha ọzọ ha nēbuso Israel; Devid we rida, ya na ndi-orù-ya, buso ndi Filistia agha; Devid we da #mbà.
16 Ishbi-benob, nke di n'etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n'ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.
17 Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.
18 O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha di kwa ọzọ na Gob nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Saf, nke di n'etiti umu Rafa.
19 Agha we di ọzọ na Gob ebusoro ndi Filistia; Elhanan nwa Jaare-oregim onye Bet-lehem we tib͕ue nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.
20 Agha we di ọzọ na Gat, ma otú nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ọnu-ọgugu-ha di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.