16 Mọ-ozi we setipu aka-ya n'ebe Jerusalem di ibibi ya, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu we si mọ-ozi ahu nke nēbibi n'etiti ndi Israel, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nọ n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.
17 Devid we gwa Jehova okwu, mb͕e ọ huru mọ-ozi ahu nke nētib͕u ndi Israel, ọ si, Le, mu onwem emehiewo, mu onwem emewo kwa ajọ omume: ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam.
18 Gad we biakute Devid n'ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.
19 Devid we rigo dika okwu Gad si di, dika Jehova nyere n'iwu.
20 Arọna we le anya, hu eze na ndi-orù-ya ka ha nāgabigakute ya: Arọna we puta, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala.
21 Arọna we si, Gini mere onye-nwem, bú eze, biakuteworo orù-ya? Devid we si, Izuru ebe-nzọcha-ọka-gi n'aka-gi, iwuru Jehova ebe-ichu-àjà, ka ewe b͕ochie ihe otiti a n'ebe ndi Israel nọ.
22 Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n'anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú: