30 Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu.
31 Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.
32 Ha we lìe Abnea nime Hebron: eze we welie olu-ya kwa ákwà n'ílì Abnea; ndi Israel nile we kwa ákwà.
33 Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si,Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu?
34 Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u:Dika onye nāda n'iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara.Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ.
35 Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu.
36 Ndi-ya nile we mata, ọ di nma n'anya-ha: dika ihe ọ bula eze mere di nma n'anya ndi-ya nile.