18 Ma ndi Filistia biara, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.
19 Devid we jua Jehova ase, si, M'gārigokuru ndi Filistia? Ì gēnye ha n'akam? Jehova we si Devid, Rigo: n'ihi na aghaghm inye ndi Filistia n'aka-gi.
20 Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n'irum, dika nkwopu miri. N'ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.
21 Ha we rapu arusi nile ha n'ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha.
22 Ndi Filistia we rigo kwa ọzọ, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.
23 Devid we jua Jehova ese, O si, Arigola: ga gburugburu rue n'azu ha, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.
24 O gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gēme ngwa: n'ihi na mb͕e ahu ka Jehova puworo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.