3 Aka-ekpe-ya gādi n'okpuru isim,Aka-nri-ya gāb͕akum.
4 Unu umu-ndinyom Jerusalem, ab͕am unu iyi,Gini mere unu ji akpọte ihu-n'anya? ma-ọbu gini mere unu ji eme ka ọ teta?Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.
5 Ònye bu nwayi a nke nēsi n'ọzara arigota,Dabere n'aru onye ihe-ya nātọ ya utọ?N'okpuru osisi apple ka m'kpọtere gi:N'ebe ahu ka ime gi nēme nne-gi,N'ebe ahu ka ime nēme ya, o we muputa gi.
6 Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi:N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu;Ekworo siri ike dika ala-mọ:Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku,Ire-ọku nke Ja onwe-ya.
7 Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya,Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya:Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya,Agēleda ya anya nke-uku.
8 Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà,Ma ọ dighi ara ọ kpuru:Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayiN'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?
9 Ọ buru na ọ bu mb͕idi,Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha:Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ,Ayi gēji ibo cedar mechibido ya.