10 Ma dika ha si di n'ile ha anya, otù oyiyi ka ha anọ nwere, dika agāsi na wheel di n'etiti wheel.
11 Mb͕e ha nāga, n'akuku anọ ha ka ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga, kama n'ebe ahu nke isi-ha nēche iru, n'azu ya ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga.
12 Anu-aru nile ha na azu-ha na aka-ha na nkù-ha na wheel-ha juputara n'anya anya buruburu, ọ bu ha anọ ka wheel nile ha diri.
13 Ma wheel anọ ahu, ha ka anākpọ na ntim abua, Ihe nākpọre.
14 Ma iru anọ diri cherub ọ bula nime ha: otù iru bu iru cherub ahu, iru nke-abua bu iru madu, nke-atọ bu iru ọdum, nke-anọ bu iru ugo.
15 Cherubim we bulie onwe-ha elu: nka bu ihe ahu nke di ndu nke m'huru n'akuku osimiri Keba.
16 Ma mb͕e cherubim nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e cherubim nāchili nkù-ha isi n'elu uwa bulie onwe-ha elu, wheel-ha adighi-esi kwa n'akuku ha chigharia.