16 n'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ebe M'meworo ka ha je n'ebe di anya n'etiti mba nile, ebe M'chusawo-kwa-ra ha n'ala nile, M'gāghọ-kwa-ra ha ebe nsọ nwa mb͕e ntà n'ala nile ebe ha bàworo.
17 N'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchikọputa unu nime ndi nile di iche iche, me kwa ka unu si n'ala nile ebe achusaworo unu zukọta, M'gēnye kwa unu ala Israel.
18 Ha gābà kwa n'ebe ahu, ha gēsi kwa na ya wezuga ihe-ya nile jọb͕uru onwe-ha, na ihe-árú-ya nile.
19 M'gēnye kwa ha otù obi, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu; M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-ha, nye ha obi anu-aru:
20 ka ha we jegharia n'ukpurum nile, debe kwa ikpém nile, me ha: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke.
21 Ma ndi obi-ha nējeso obi nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha na ihe-árú nile ha, uzọ-ha ka M'gātukwasi n'isi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
22 Cherubim ahu we chilie nkù-ha, wheel nile ha di kwa n'akuku ha; ebube nke Chineke nke Israel di kwa n'elu ha n'elu.